29 Burunụ n’obi na Jehova enyela unu Ụbọchị Izu Ike.+ Ọ bụ ya mere o ji enye unu ihe unu ga-eri ụbọchị abụọ n’ụbọchị nke isii. Onye ọ bụla ga-anọ n’ebe o bi. Onye apụkwala apụ n’ụbọchị nke asaa.”
10 Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike a ga na-edebere Jehova bụ́ Chineke gị. Arụla ọrụ ọ bụla, ma gị ma nwa gị nwoke ma nwa gị nwaanyị ma ohu gị nwoke ma ohu gị nwaanyị ma anụ ụlọ gị ma onye mbịarambịa nọ n’ebe i bi.+
12 M gwakwara ha ka ha na-edebe ụbọchị izu ike m,+ ka ọ bụrụ ihe ga-egosi na mụ na ha gbara ndụ,+ ka ha wee mara na ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, mere ka ha dịrị nsọ.