15 Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko ruo ụbọchị asaa.+ N’ụbọchị nke mbụ, unu ga-ewepụ ihe na-eko achịcha n’ụlọ unu, n’ihi na onye ọ bụla nke riri ihe e tinyere ihe na-eko achịcha, malite n’ụbọchị nke mbụ ruo n’ụbọchị nke asaa, a ga-egbu ya.*
8 N’ihi ya, anyị mewe ememme ọzọ,+ ka anyị ghara iji achịcha ochie koro eko, gharakwa iji ihe na-eko achịcha nke nọchiri anya ime mmehie na ime ihe ọjọọ. Kama ka anyị jiri achịcha na-ekoghị eko, nke nọchiri anya ịkwụwa aka ọtọ na ikwu eziokwu.