-
Diuterọnọmi 1:26-28Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
26 Ma unu ekweghị agbago, unu nupụkwara isi n’iwu Jehova bụ́ Chineke unu nyere.+ 27 Unu nọ n’ụlọikwuu unu na-atamu ntamu, sị, ‘Ọ bụ maka na Jehova kpọrọ anyị asị mere o ji kpọpụta anyị n’Ijipt ka o nyefee anyị n’aka ndị Amọraịt ka ha laa anyị n’iyi. 28 Olee ụdị ebe anyị na-aga? Ụmụnne anyị mere ka obi mapụ anyị.*+ Ha sịrị: “Ndị bi n’ebe ahụ dị ukwuu ma too ogologo karịa anyị. Obodo ha dị ukwuu, a rụsikwara ha ike ruo n’eluigwe.*+ Anyị hụkwara ndị Anakim+ n’ebe ahụ.”’
-