29 N’ala ịkpa a ka ozu unu ga-atọgbọrọ,+ ya bụ, unu niile ndị katọrọ m, bụ́ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe.+ 30 E nweghị onye n’ime unu ga-aba n’ala ahụ m ṅụrụ iyi na unu ga-ebi na ya,+ ma e wepụ Keleb nwa Jefune na Joshụa nwa Nọn.+