-
Diuterọnọmi 1:34-38Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
34 “N’oge ahụ niile, Jehova nụrụ ihe unu na-ekwu. Iwe wee wee ya, ya aṅụọ iyi, sị,+ 35 ‘E nweghị otu onye n’ime ụmụ nwoke so n’ọgbọ ọjọọ a ga-ahụ ezigbo ala ahụ m ṅụrụ iyi na m ga-enye nna nna unu hà,+ 36 ma e wepụ Keleb nwa Jefune. Ọ ga-ahụ ya. M ga-enyekwa ya na ụmụ ya ala ahụ ọ gara na ya n’ihi na o ji obi ya niile soro Jehova.+ 37 (Jehova wesadịrị m iwe n’ihi unu. Ọ sịrị m, “Gịnwa agaghịkwa abanye n’ebe ahụ.+ 38 Ọ bụ Joshụa nwa Nọn, onye na-ejere gị ozi,*+ ga-abanye n’ala ahụ.’+ Mee ka ọ dị ike+ n’ihi na ọ bụ ya ga-eduru ndị Izrel banye n’ala ahụ ka ha nweta ya.”)
-