4 Jehova bụ́ Chineke unu emeela ka ụmụnne unu zuru ike, otú o kwere ha ná nkwa.+ Unu nweziri ike ịlaghachi n’ụlọikwuu unu n’ala Mosis ohu Jehova nyere unu n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan.+
9 Mgbe ihe a mechara, ebo Ruben, ebo Gad, na ọkara ebo Manase hapụrụ ndị Izrel ndị ọzọ na Shaịlo, nke dị n’ala Kenan, lawa Gilied,+ bụ́ ala ha ketara. Ebe a ka ha bi n’ihi na ọ bụ ebe Jehova gwara Mosis ka ha biri.+