-
Diuterọnọmi 3:19, 20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
19 Ọ bụ naanị ndị nwunye unu, ụmụ unu, na anụ ụlọ unu ga-anọrọ n’obodo ndị m nyere unu (o doro m anya na unu nwere ọtụtụ anụ ụlọ), 20 ruo mgbe Jehova ga-eme ka ụmụnne unu zuru ike, otú o meere unu, ha ebirikwa n’ala Jehova bụ́ Chineke unu ga-enye ha n’ofe Osimiri Jọdan. Mgbe ahụ, onye ọ bụla n’ime unu ga-alọghachi n’ebe o ketara ala n’ala m nyere unu.’+
-
-
Joshụa 1:14, 15Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 Ndị nwunye unu, ụmụ unu na anụ ụlọ unu ga-anọ n’ala ahụ Mosis nyere unu n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan.+ Ma unu niile, bụ́ ndị dike,+ ga-ahazi onwe unu ka ndị agha, buru ụmụnne unu+ ụzọ gafee Osimiri Jọdan. Unu ga na-enyekwara ha aka 15 ruo mgbe Jehova ga-eme ka ụmụnne unu zuru ike otú ahụ o meere ununwa, ha enwetakwa ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu ga-enye ha. E mechaa, unu ga-alaghachizi n’ala nke e kenyere unu ma biri na ya, ya bụ, ala ahụ Mosis ohu Jehova nyere unu n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan.’”+
-