18 N’ụbọchị ahụ, Jehova na Ebram gbara ndụ.+ Ọ sịrị ya: “Ọ bụ ụmụ* gị ka m ga-enye ala a,+ malite n’osimiri Ijipt ruo ná nnukwu osimiri, bụ́ osimiri Yufretis,+
8 M ga-enyekwa gị na umụ* gị ala ahụ i biri mgbe ị bụ onye mbịarambịa,+ ya bụ, ala Kenan niile. M ga-enye ya unu ka ọ bụrụ nke unu ruo mgbe niile. M ga-abụkwa Chineke ha.”+