-
2 Samuel 6:6, 7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 Ma, mgbe ha ruru ebe a na-akpọ Nekọn, bụ́ ebe a na-azọcha ọka, Ọza matịrị aka jide Igbe ezi Chineke,+ n’ihi na ọ fọrọ obere ka ehi ndị kpụ ụgbọala ahụ kwatuo Igbe ahụ. 7 Jehova bụ́ ezi Chineke wee wesa Ọza ezigbo iwe, gbuokwa ya+ ebe ahụ maka na ọ dara iwu ya.+ Ọ nwụkwara ebe ahụ n’akụkụ Igbe ezi Chineke.
-