4 Ọ kpọnyeziri Jekọb Bilha bụ́ nwaanyị na-ejere ya ozi ka ọ bụrụ nwunye ya, ya na Jekọb wee nwee mmekọahụ.+ 5 Bilha wee dịrị ime, mechaa mụọrọ Jekọb nwa nwoke. 6 Rechel wee sị: “Chineke ekpeerela m ikpe. O geela m ntị, nke mere na o nyere m nwa nwoke.” Ọ bụ ya mere o ji gụọ ya Dan.+