7 Adị m afọ iri anọ mgbe Mosis ohu Jehova si na Kedesh-bania zipụ m, mụ agaa nyopụta otú ala a dị.+ Mgbe m lọtara, m kọọrọ ya ihe m hụrụ n’ezoghị ọnụ.+ 8 Ụmụnne m mụ na ha so gaa mere ka obi mapụ ndị obodo anyị. Ma, m ji obi m niile soro Jehova bụ́ Chineke m.+