-
Ọnụ Ọgụgụ 28:11, 12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 “‘Ná mbido ọnwa ọ bụla,* unu ga-eji oké ehi abụọ, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ahụ́ dị mma, ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ,+ 12 nakwa ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ka ọ bụrụ àjà ọka+ maka oké ehi nke ọ bụla, nakwa ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ka ọ bụrụ àjà ọka maka otu ebule ahụ,+
-
-
Ọnụ Ọgụgụ 29:6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 Unu ga-achụ ihe ndị a n’àjà, ha na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ kwa ọnwa na àjà ọka ya na ya na-agakọ,+ chụọkwa àjà a na-esu ọkụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ.+ Unu ga-achụkọta ha na àjà mmanya ha+ otú e nyere iwu ka e si na-achụ ha, ka ha bụrụ àjà na-esi ísì ọma,* àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova.
-