11 “‘Ná mbido ọnwa ọ bụla,* unu ga-eji oké ehi abụọ, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ahụ́ dị mma, ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ,+
14 Àjà mmanya ha na ha ga-agakọ ga-abụ ọkara otu hin mmanya maka otu oké ehi+ na otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu hin maka ebule ahụ+ nakwa otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin maka otu nwa ebule.+ Ọ bụ ya bụ àjà a na-esu ọkụ a ga na-achụ kwa ọnwa n’afọ.