22 M ga-apụta n’ihu gị n’ebe ahụ wee si n’elu okwuchi igbe ahụ+ gwa gị okwu. M ga-esi n’agbata cherob abụọ ahụ dị n’elu igbe ọgbụgba ndụ* ahụ mee ka ị mara ihe niile m ga-enye gị n’iwu ka ị gwa ndị Izrel.
36 Ị ga-asụ ụfọdụ n’ime ya nke ọma ka ọ dị ka ntụ ma dowe ụfọdụ n’ime ya n’ihu igbe ọgbụgba ndụ* ahụ dị n’ụlọikwuu nzute, bụ́ ebe m ga na-apụta n’ihu gị. Ọ ga-abụrụ unu ihe kacha nsọ.
2 Jehova gwara Mosis, sị: “Gwa Erọn nwanne gị nwoke na ọ bụghị mgbe ọ bụla ka ọ ga na-abata n’ebe nsọ,+ n’ime ebe ahụ e gechiri ákwà mgbochi,+ n’ihu okwuchi Igbe ahụ, ka ọ ghara ịnwụ,+ n’ihi na m ga na-apụta n’ígwé ojii+ n’elu okwuchi+ Igbe ahụ.