-
Ọnụ Ọgụgụ 16:13, 14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 Ọ̀ bụ obere ihe na i si n’ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya* kpọpụta anyị ka i gbuo anyị n’ala ịkpa a?+ Ugbu a, ị̀ chọkwuru ime onwe gị onyeisi anyị?* 14 Ka ọ dị ugbu a, ị kpọbabeghị anyị n’ala ọ bụla mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ I nyebeghịkwa anyị ala na ubi vaịn. Ị̀ ga-aghụpụta ụmụ nwoke ndị ahụ anya?* Anyị agaghị abịa!”
-