11 Ha họpụtaziri ndị isi ga na-amanye ha ịrụ ọrụ ike ma na-emegbu ha.+ Ha manyekwara ha ịrụrụ Fero obodo ndị a ga na-akwakọba ihe na ha, ya bụ, Paịtọm na Ramsis.+
14 Ha ji ọrụ ike ha na-amanye ha ịrụ mee ka ndụ kwụsị ịtọ ha ụtọ, na-amanye ha ịgwọ ájá ụrọ na ịkpụ brik, meekwa ka ha na-arụ ụdị ọrụ ike dị iche iche n’ubi. N’eziokwu, ha na-echi ha ọnụ n’ala ma na-eme ka ha na-arụgbu onwe ha n’ọrụ.+