-
Nehemaya 13:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 N’ụbọchị ahụ, a gụụrụ mmadụ niile akwụkwọ Mosis.+ E wee chọpụta na e dere na ya na e nweghị onye Amọn ma ọ bụ onye Moab+ ga-abata n’ọgbakọ ezi Chineke,+ 2 n’ihi na ha enyeghị ndị Izrel achịcha na mmiri, kama ha goro Belam ka ọ bụọ ha ọnụ.+ Ma, Chineke anyị mere ka ọnụ ọ gaara abụ ha bụrụzie ngọzi.+
-