-
Jenesis 38:7-10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 Ma àgwà Ea, ọkpara Juda, adịghị Jehova mma. Jehova wee gbuo ya. 8 N’ihi ya, Juda gwara Onan, sị: “Gị na nwunye nwanne gị nwee mmekọahụ. Kuchie ya ka ị mụtara nwanne gị nwoke nwa.”+ 9 Ma Onan ma na nwa ọ ga-amụta agaghị abụ nke ya.+ N’ihi ya, mgbe ya na nwunye nwanne ya na-enwe mmekọahụ, ọ na-anyụfusị ọbara ọcha ya n’ala ka o wee ghara ịmụtara nwanne ya nwoke nwa.+ 10 Ihe ahụ o mere dị njọ n’anya Jehova. N’ihi ya, o gbukwara ya.+
-