9 O dokwara unu anya na Jehova bụ́ Chineke unu bụ ezi Chineke, Chineke e kwesịrị ịtụkwasị obi, onye na-anaghị emebi ọgbụgba ndụ ya na ndị hụrụ ya n’anya na ndị na-edebe iwu ya gbara, na-ahụkwa ha n’anya* ruo otu puku ọgbọ.+
19 N’ihi ya, ka ndị na-ata ahụhụ maka na ha na-eme ihe dị Chineke mma mere ihe dị mma+ na-aga. Ka ha nyefeekwa Chineke onwe ha.* Ọ bụ ya kere anyị, anyị kwesịkwara ịtụkwasị ya obi.