27 N’ihi na ama m nke ọma na unu bụ ndị nnupụisi+ na ndị isi ike.+ Ọ bụrụ na unu na-enupụrụ Jehova isi otú a mgbe m ka nọ ndụ, unu ga-aka enupụ isi ma m nwụọ.
19 Ma mgbe onyeikpe ahụ nwụrụ, ha na-ebidokwa kpawa àgwà ọjọọ karịa ndị nna nna ha, na-efe chi dị iche iche ma na-akpọrọ ha isiala.+ Ha akwụsịghị omume ha na isi ike ha.