17 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu bụ Chi kacha chi niile+ na Onyenwenụ kacha ndị nwenụ niile, Chineke dị ebube, onye dị ike, na onye e kwesịrị ịna-atụ egwu, onye na-anaghị ele onye ọ bụla anya n’ihu,+ ọ naghịkwa anara aka azụ.*
7 Ụjọ wee jide ndị Filistia, ha asị: “Chineke abatala ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu.”+ Ha sịkwara: “Anyị efuola, n’ihi na ụdị ihe a emetụbeghị. 8 Nke anyị na-eme agwụla! Ònye ga-azọpụta anyị n’aka Chineke a dị ebube? Ọ bụ ya bụ Chineke ahụ si ụzọ dị iche iche gbuo ndị Ijipt n’ala ịkpa.+