-
1 Samuel 15:1-3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 Samuel wee sị Sọl: “Jehova ziri m, mụ abịa tee gị mmanụ ka ị bụrụ eze ndị ya Izrel.+ Ugbu a, nụrụ ihe Jehova ga-agwa gị.+ 2 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: ‘M ga-eme ka ndị Amalek zaa ajụjụ maka agha ha lụsoro ndị Izrel n’ụzọ mgbe ha si Ijipt na-apụta.+ 3 Gaa gbuo ndị Amalek,+ laakwa ha na ihe niile ha nwere n’iyi.+ Ahapụkwala ha ndụ.* Gbuo ha niile,+ ma nwoke ma nwaanyị, ma nwatakịrị ma nwa ọhụrụ, ma ehi ma atụrụ, ma kamel ma jakị.’”+
-