6 N’ihi na unu bụụrụ Jehova bụ́ Chineke unu ndị dị nsọ, Jehova bụ́ Chineke unu ahọrọkwala unu ka unu bụrụ ndị ya, ndị pụrụ iche n’ime ndị niile nọ n’ụwa.+
28“Ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya na-edebe iwu ya niile m na-enye unu taa, Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka unu ka mba ndị ọzọ niile dị n’ụwa.+