6 N’afọ nke itoolu n’ọchịchị Hoshia, eze Asiria meriri Sameria,+ dọrọkwa ndị Izrel n’agha+ laa Asiria. Ọ hapụrụ ha ka ha biri na Hela na Hebọ, nke dị n’akụkụ osimiri Gozan,+ nakwa n’obodo dị iche iche ndị Midia nwe.+
11 N’ihi ya, Jehova mere ka ndị isi agha eze Asiria bịa lụso ha agha. Ha jidekwara Manase, ganye nko n’ahụ́ ya,* tụọkwa ya ịga abụọ e ji ọla kọpa mee ma kpụga ya Babịlọn.
5 Jehoyakim+ dị afọ iri abụọ na ise mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jeruselem. Ọ nọkwa na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova bụ́ Chineke ya.+6 Nebukadneza+ eze Babịlọn wee bịa lụso ya agha, tụọ ya ịga abụọ e ji ọla kọpa mee ma kpụrụ ya laa Babịlọn.+