-
1 Ndị Eze 9:8, 9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 Ụlọ a ga-abụzi ụlọ e bibiri ebibi.+ Onye ọ bụla nke na-agafe ya ga-ekporopụ anya na-ele ya, fụọ mkpọrọhịhị, na-asịkwa, ‘Gịnị mere Jehova ji mee ala a na ụlọ a otú a?’+ 9 A ga-asịkwa ya, ‘Ọ bụ n’ihi na ha hapụrụ Jehova bụ́ Chineke ha, onye kpọpụtara ndị nna nna ha n’Ijipt. Ha nabatakwara chi ọzọ dị iche iche, kpọwara ha isiala ma fewe ha. Ọ bụ ya mere Jehova ji mee ka ọdachi a niile dakwasị ha.’”+
-
-
2 Ihe E Mere 7:21, 22Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
21 Ụlọ a ga-abụzi ụlọ e bibiri ebibi. Onye ọ bụla nke na-agafe ya ga-ekporopụ anya na-ele ya,+ na-asịkwa, ‘Gịnị mere Jehova ji mee ala a na ụlọ a otú a?’+ 22 A ga-asịkwa ya, ‘Ọ bụ n’ihi na ha hapụrụ Jehova+ bụ́ Chineke ndị nna nna ha, onye kpọpụtara ha n’Ijipt.+ Ha nabatakwara chi ọzọ dị iche iche, kpọwara ha isiala ma fewe ha.+ Ọ bụ ya mere o ji mee ka ọdachi a niile dakwasị ha.’”+
-