19 Mịkaya asị: “Nụrụnụ ihe Jehova chọrọ ka m gwa unu: M hụrụ ka Jehova nọ n’ocheeze ya+ nakwa ka ndị mmụọ ozi niile guzo n’aka nri ya nakwa n’aka ekpe ya.+
13 Ma onyeisi+ alaeze Peshia nọchiiri m ụzọ ruo ụbọchị iri abụọ na otu. Ma Maịkel,*+ otu n’ime ndị isi kachanụ, bịara inyere m aka. M nọkwa n’ebe ahụ n’akụkụ ndị eze Peshia.