10 “Ọ bụrụ na unu erute obodo nso ka unu lụso ya agha, unu ga-agwa ndị obodo ahụ ihe ha ga-eme ka unu na ha mee udo.+ 11 Ọ bụrụ na ha ekwuo na ha chọrọ udo ma megheere unu ọnụ ụzọ ámá ha, ndị niile nọ n’obodo ahụ ga-abụ ndị ohu unu, ha ga na-ejekwara unu ozi.+