-
Diuterọnọmi 4:41-43Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
41 N’oge ahụ, Mosis wepụtara obodo atọ n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan.+ 42 Ọ bụrụ na mmadụ egbuo mmadụ ibe ya n’amaghị ụma, ya abụrụkwa na ọ kpọbughị ya asị,+ ọ ga-agbaga n’otu n’ime obodo ndị a wee dịrị ndụ.+ 43 Obodo nke mbụ bụ Biza+ nke dị n’ala ịkpa, n’ala dị larịị. Ọ bụ maka ụmụ Ruben. Nke abụọ bụ Remọt+ nke dị na Gilied. Ọ bụ maka ụmụ Gad. Nke atọ bụ Golan+ nke dị na Beshan. Ọ bụ maka ụmụ Manase.+
-