27 E sikwa n’ọkara ebo Manase nye ụmụ Geshọn,+ bụ́ ezinụlọ ụmụ Livaị, obodo onye gburu mmadụ ga-agbaba. E nyere ha Golan,+ nke dị na Beshan, na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa nakwa Bieshtera na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. Ha dị obodo abụọ.
71 Ha si n’ezinụlọ ọkara ebo Manase nye ụmụ Geshọm obodo ndị a: Golan,+ nke dị na Beshan, na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa nakwa Ashtarọt na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa.+