9 Chineke gwakwara Ebreham, sị: “Gị na ụmụ gị n’ọgbọ ha niile emebikwala ọgbụgba ndụ mụ na unu. 10 Ihe a bụ ndụ mụ na gị na-agba, nke gị na ụmụ gị na-agaghị emebi: A ga-ebi nwoke ọ bụla n’ime unu úgwù.+ 11 Unu ga-ebi úgwù. Ọ ga-abụ ihe àmà na-egosi na mụ na unu gbara ndụ.+