65 N’ihi na Jehova kwuru banyere ndị ahụ, sị: “Ha ga-anwụrịrị n’ala ịkpa.”+ N’ihi ya, e nweghị nwoke ọ bụla fọrọ n’ime ha ma e wepụ Keleb nwa Jefune na Joshụa nwa Nọn.+
14 Anyị si na Kedesh-bania gagide ije gafere Ndagwurugwu Zired. Ije a were anyị afọ iri atọ na asatọ, ruo mgbe ọgbọ ụmụ nwoke so ná ndị agha nwụchara, otú Jehova ṅụụrụ ha iyi.+