-
Ndị Ikpe 7:24, 25Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
24 Gidiọn dunyere ndị ozi ka ha gaa n’ala Ifrem niile bụ́ ugwu ugwu zie ha, sị: “Gbadaanụ lụso ndị Midian agha, nọchiekwanụ mmiri ndị dị n’ebe ahụ ruo Bet-bara nakwa Osimiri Jọdan tupu ha erute.” E wee kpọkọta ndị Ifrem niile, ha anọchie mmiri ndị ahụ ruo Bet-bara nakwa Osimiri Jọdan. 25 Ha jidekwara mmadụ abụọ bụ́ ndị isi ndị Midian, ya bụ, Oreb na Zieb. Ha gburu Oreb n’elu oké nkume e mechara kpọwa oké nkume Oreb,+ gbuokwa Zieb n’ebe a na-azọchapụta mmanya e mechara kpọwa ebe a na-azọchapụta mmanya Zieb. Ha chụụrụ ndị Midian na-aga.+ Ha butekwaara Gidiọn isi Oreb na isi Zieb ná mpaghara Osimiri Jọdan.
-