47 Ala Dan ketara abaghị ha.+ N’ihi ya, ha gara lụso Lishem agha,+ merie ya ma jiri mma agha bibie ya. Ha weghaara ya ma biri na ya. Ha gụgharịkwara Lishem aha, kpọwa ya Dan, aha nna nna ha.+ 48 Ebe ndị a ka ebo Dan ketara, n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Obodo ndị a na ógbè ha niile bụ nke ha.