-
Ndị Ikpe 17:4, 5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Mgbe o nyeghachiri nne ya ọlaọcha ahụ, nne ya weere narị mkpụrụ ọlaọcha abụọ (200) nye onye na-eji ọlaọcha akpụ ihe. O mere arụsị a pịrị apị na arụsị a kpụrụ akpụ. E wee dowe ha n’ụlọ Maịka. 5 Nwoke a bụ́ Maịka nwere ụlọ arụsị. O mere efọd+ na arụsị ezinụlọ*+ ma họpụta otu n’ime ụmụ ya ndị nwoke ka ọ bụrụ onye nchụàjà ya.+
-