10 Ndị Filistia wee lụso ndị Izrel agha, merie ha,+ onye ọ bụla n’ime ha agbalaga n’ụlọikwuu ya. Ndị e gburu karịrị akarị. E gburu puku ndị agha Izrel iri atọ (30,000) na-eji ụkwụ aga. 11 E bukwaara Igbe Chineke, ụmụ Ịlaị abụọ, bụ́ Họfnaị na Finihas, nwụkwara.+