Ọpụpụ 15:11 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 11 Jehova, ònye n’ime chi niile dị ka gị?+ Ònye dị ka gị, gị onye na-egosi na ị dị ezigbo nsọ?+ Onye a ga-eji abụ otuto sọpụrụ, Onye na-eme ihe ndị dị ịtụnanya.+ Diuterọnọmi 4:35 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 35 E gosila unu ihe ndị a ka unu wee mara na Jehova bụ ezi Chineke.+ E nweghị Chineke ọzọ ma e wepụ ya.+ Abụ Ọma 73:25 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 25 Ènwere m onye ọzọ n’eluigwe? Ebe ọ bụ na m nwere gị, e nweghị ihe ọzọ m chọrọ n’ụwa.+ Abụ Ọma 86:8 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 8 Jehova, e nweghị chi dị ka gị n’ime chi niile.+ E nweghị onye rụtụrụla ọrụ ndị ị rụrụ.+ Abụ Ọma 89:6 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 6 N’ihi na ònye ka a ga-eji tụnyere Jehova n’eluigwe?+ N’ime ụmụ Chineke,+ è nwere onye dị ka Jehova?
11 Jehova, ònye n’ime chi niile dị ka gị?+ Ònye dị ka gị, gị onye na-egosi na ị dị ezigbo nsọ?+ Onye a ga-eji abụ otuto sọpụrụ, Onye na-eme ihe ndị dị ịtụnanya.+
35 E gosila unu ihe ndị a ka unu wee mara na Jehova bụ ezi Chineke.+ E nweghị Chineke ọzọ ma e wepụ ya.+
6 N’ihi na ònye ka a ga-eji tụnyere Jehova n’eluigwe?+ N’ime ụmụ Chineke,+ è nwere onye dị ka Jehova?