45 Devid wee gwa onye Filistia ahụ, sị: “I ji mma agha na ube na árọ̀+ na-abịa ịlụso m ọgụ, ma m ji aha Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ bụ́ Chineke ndị agha Izrel, onye ị na-akparị,* na-abịa ịlụso gị ọgụ.+
17 Sọl mechara sị Devid: “Ị̀ hụla ada m bụ́ Mirab?+ M ga-akpọnye gị ya ka ị lụwa.+ Ma, na-akata obi na-ejere m ozi otú i si eme, na-alụkwara Jehova agha.”+ Ma Sọl gwara onwe ya, sị: ‘Achọghị m igbu ya n’onwe m. Kama, ka ọ bụrụ ndị Filistia ga-egbu ya.’+