18 Otu n’ime ndị na-ejere ya ozi sịrị ya: “Ahụla m otú nwa Jesi onye Betlehem si akpọ ụbọ ka aka ochie. Obi kara ya. Ọ bụkwa dike n’agha.+ Ọ ma ka e si ekwu okwu, maakwa mma.+ Jehova nọnyekwaara ya.”+
18 Eze na ndị niile na-ejere ya ozi so na-aga, ma ndị Keretaịt niile ma ndị Peletaịt*+ niile, ma narị ụmụ nwoke isii (600) bụ́ ndị Gat.+ Ha niile so eze na-aga, ya ana-eleru ha anya.
8 Ndị a bụ aha ndị dike bụ́ ndị agha Devid:+ Josheb-bashibet, onye Takimọnaịt, onyeisi ndị dike atọ.+ E nwere mgbe o ji ube ya gbuo narị mmadụ asatọ (800) otu mgbe.
18 Abishaị+ nwanne Joab nwa Zeruya+ bụ onyeisi ndị dike atọ ọzọ. E nwere mgbe o ji ube ya gbuo narị mmadụ atọ (300). Aha ya na-edekwa ude ka nke ndị dike atọ mbụ ahụ.+