3 Ụmụ ndị amụma,* ndị nọ na Betel, pụtara bịakwute Ịlaịsha, sị ya: “Ị̀ makwa na taa ka Jehova ga-ewepụ nna gị ukwu ka ọ ghara ịbụkwa onyeisi gị?”+ Ya asị ha: “Ama m. Gbanụ nkịtị.”
11 Jehoshafat asị: “Ọ̀ bụ na e nweghị onye amụma Jehova ebe a ka anyị si n’aka ya jụọ Jehova ase?”+ Otu n’ime ndị na-ejere eze lzrel ozi asị: “Ịlaịsha+ nwa Shefat nọ ebe a. Ọ bụ ya nọ na-ejere Ịlaịja ozi.”*+