31 Ma, eze Siria gwara ndị isi iri atọ na abụọ na-agba ụgbọ ịnyịnya ya,+ sị: “Unu alụsola onye ọ bụla ọgụ, ma onye ukwu ma onye nta, ma e wezụga eze Izrel.”
35 Agha ahụ bịara sie ezigbo ike n’ụbọchị ahụ, nke na a kwụwara eze ọtọ n’ụgbọ ịnyịnya ahụ chee ya ihu n’ebe ndị Siria nọ. Ọbara nke si n’ebe e merụrụ ya ahụ́ na-agbapụta nọ na-awụsa n’ime ụgbọ ịnyịnya agha ahụ. Ma, ọ nwụrụ ná mgbede ụbọchị ahụ.+
33 Ma, e nwere otu nwoke gbara ụta n’ebughị onye ọ bụla n’obi, ma ọ gbatara ya eze Izrel n’ebe e jikọrọ uwe agha ya. Eze asị onye na-anya ụgbọ ịnyịnya ya: “Tụgharịa, bupụ m n’ọgbọ agha a, n’ihi na e merụọla m ezigbo ahụ́.”+