34 Fero Niko chikwara Elayakim nwa Josaya eze ka ọ nọchie Josaya nna ya. Ọ gbanwere aha ya, a kpọwazie ya Jehoyakim. Ma, ọ kpọọrọ Jehoahaz kpọta Ijipt,+ ọ bụkwa ebe ahụ ka ọ nọ nwụọ.+
5 Jehoyakim+ dị afọ iri abụọ na ise mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jeruselem. Ọ nọkwa na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova bụ́ Chineke ya.+