-
1 Samuel 9:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 E nwere otu nwoke, onye ebo Benjamin, bara ezigbo ọgaranya. Aha ya bụ Kish,+ nwa Abayel, nwa Ziroa, nwa Bikorat, nwa Afaya, onye ebo Benjamin.+ 2 O nwere nwa nwoke aha ya bụ Sọl.+ Nwa ya a mara mma okorobịa. O nweghịkwa nwoke ọ bụla n’Izrel ka ya mma. Ọ kacha mmadụ niile ogologo. Ndị na-esote ya n’ogologo na-eru ya n’ubu.
-