23 Ọkara ebo Manase+ biri n’ala ahụ malite na Beshan ruo Bel-hemọn na Sina nakwa n’Ugwu Hemọn.+ Ha dị nnọọ ọtụtụ. 24 Ndị a bụ ndị isi n’ọnụmara ha dị iche iche: Ife, Ịshaị, Iliel, Azriel, Jeremaya, Họdavaya, na Jadiel. Ha bụ ndị dike n’agha, ndị a ma ama, na ndị isi ezinụlọ ndị nna nna ha.