-
Jenesis 36:31-39Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
31 Ndị a bụ ndị eze chịrị ndị Ịdọm+ tupu eze ọ bụla achịa ndị Izrel.+ 32 Bila nwa Biọ chịrị n’Ịdọm. Aha obodo ya bụ Dinhaba. 33 Mgbe Bila nwụrụ, Jobab nwa Zira, onye Bọzra, nọchiri ya malite ịchị. 34 Mgbe Jobab nwụrụ, Husham onye Timan, nọchiri ya malite ịchị. 35 Mgbe Husham nwụrụ, Hedad nwa Bidad, onye meriri ndị Midian+ n’ala Moab, nọchiri ya malite ịchị. Aha obodo ya bụ Evit. 36 Mgbe Hedad nwụrụ, Samla onye Masrika nọchiri ya malite ịchị. 37 Mgbe Samla nwụrụ, Sheọl onye Rehobọt, nọchiri ya malite ịchị. Rehobọt a dị n’akụkụ osimiri. 38 Mgbe Sheọl nwụrụ, Bel-henan nwa Akbọ nọchiri ya malite ịchị. 39 Mgbe Bel-henan nwa Akbọ nwụrụ, Heda nọchiri ya malite ịchị. Aha obodo ya bụ Peyu. Aha nwunye ya bụ Mehetabel. Mehetabel bụ nwa Metred, Metred abụrụ nwa Mizahab.
-