-
1 Ihe E Mere 29:6, 7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 Ndị isi ọnụmara dị iche iche, ndị isi ebo dị iche iche n’Izrel, ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha na ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha,+ nakwa ndị isi na-ahụ maka ọrụ eze+ wee bido inye onyinye. 7 Ha nyere puku talent ọlaedo ise (5,000), puku mkpụrụ ego darik* iri (10,000), puku talent ọlaọcha iri (10,000), puku talent ọla kọpa iri na asatọ (18,000), nakwa ígwè dị otu narị puku (100,000) talent maka ịrụ ụlọ ezi Chineke.
-