28 Gịnị mere unu ji na-echegbu onwe unu banyere uwe? Mụtanụ ihe n’otú okooko lili dị n’ọhịa si eto. Ha anaghị arụgbu onwe ha n’ọrụ, ha anaghịkwa akpa ogho. 29 Ma ana m asị unu na Solomọn+ eyighị uwe mara mma ka otu n’ime ha n’agbanyeghị ebube ya niile.
42 A ga-akpọlite eze nwaanyị ndịda na ọgbọ a n’Ụbọchị Ikpe. Ọ ga-amakwa ọgbọ a ikpe, n’ihi na o si na nsọtụ ụwa bịa ịnụ okwu Solomọn onye amamihe na-ekwu.+ Ma, onye ka Solomọn nọ ebe a.+