-
1 Ndị Eze 8:27-30Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
27 “Ma Chineke ọ̀ ga-ebi n’ụwa n’eziokwu?+ Eluigwe, ya bụ, eluigwe niile, enweghị ike ịba gị,+ ma ya fọdụzie ụlọ a m rụrụ.+ 28 Jehova bụ́ Chineke m, biko, gee ntị n’ekpere ohu gị na-ekpe nakwa n’arịrịọ ọ na-arịọ ka i meere ya amara. Nụkwa ákwá ohu gị na-ebesara gị ka i nyere ya aka na ekpere ọ na-ekpe n’ihu gị taa. 29 Biko, ka anya gị dịrị n’ụlọ a ehihie na abalị, n’ebe a i kwuru gbasara ya, sị, ‘Aha m ga-adịgide na ya.’+ Geekwa ntị n’ekpere ohu gị chere ihu ebe a na-ekpe.+ 30 Biko, nụrụ arịrịọ ohu gị na-arịọ gị ka i meere ya amara, nụrụkwa nke ndị Izrel bụ́ ndị gị ga-eche ihu ebe a na-arịọ. Nọrọ n’eluigwe ebe i bi nụ ya.+ Biko, nụ ya ma gbaghara.+
-