40 Ha ga-ekwupụtazi mmehie ha+ na mmehie ndị nna nna ha, kwupụtakwa na ndị nna nna ha bụ ndị a na-ekwesịghị ịtụkwasị obi. Ha ga-ekwetakwa na ha bụ ndị a na-ekwesịghị ịtụkwasị obi nakwa na ha nupụụrụ m isi.+
6 M wee sị: “Chineke m, ihere na-eme m, enweghịkwa m ike iwelite ihu m, Chineke m, n’ihi na mmehie anyị adịla ọtụtụ,* omume ọjọọ anyị eruokwala n’eluigwe.+