-
1 Ndị Eze 9:20-23Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 Ma ndị niile na-abụghị ndị Izrel+ fọrọnụ, ya bụ, ndị Amọraịt, ndị Het, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus,+ 21 ma ụmụ ha ma ụmụ ụmụ ha ndị fọrọ n’ala ha, ndị ndị Izrel na-enwebeghị ike ibibi, Solomọn manyere ha ka ha na-agbara ya ohu ruo taa.+ 22 Ma, o nweghị onye Izrel ọ bụla Solomọn kpọọrọ ka ọ na-agbara ya ohu,+ n’ihi na ọ bụ ha bụ ndị agha ya, ndị na-ejere ya ozi, ndị o mere ndị isi, ndị na-esote ndị isi agha ya, na ndị isi nke ndị na-agba ụgbọ ịnyịnya ya nakwa ndị isi nke ndị na-agba ịnyịnya ya. 23 Ndị isi nke ndị na-enyere Solomọn aka dị narị mmadụ ise na iri ise (550). Ha bụ ndị isi nke ndị na-arụ ọrụ.+
-