-
1 Ndị Eze 9:26-28Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
26 Eze Solomọn rụkwara ọtụtụ ụgbọ mmiri n’Iziọn-giba,+ nke dị nso n’Ilọt, n’ụsọ Oké Osimiri Uhie, n’Ịdọm.+ 27 Haịram ziri ndị na-ejere ya ozi, ndị bụ́ aka ochie n’ịkwọ ụgbọ mmiri, ka ha na ndị na-ejere Solomọn ozi soro na-akwọ ụgbọ mmiri ndị ahụ.+ 28 Ha gara Ofa+ buru narị talent ọlaedo anọ na iri abụọ (420) butere Eze Solomọn.
-